12Meenụ ya maka anụ ụlọ ọbụla nʼoge niile ọbụla unu na-achụ aja.
13“ ‘Onye ọbụla bụ nwa afọ ala aghaghị ime ihe ndị a mgbe ọbụla o wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye dịka onyinye isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
14Nʼọgbọ niile na-abịa, mgbe ọbụla onye ọbịa, maọbụ onye ọzọ bi nʼetiti unu wetara onyinye e sitere nʼọkụ nye, nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị, ọ ghaghị ịgbaso ụzọ a nye onyinye ya.
15Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
16Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”