15Ọgbakọ ụmụ Izrel ga-enwe otu iwu ga-adịrị unu na ndị ọbịa bi nʼetiti unu. Nke a bụ ụkpụrụ ebighị ebi ga-adịrị ọgbọ niile na-abịa. Unu na ndị ọbịa ga-abụ otu nʼihu Onyenwe anyị.
16Otu iwu na otu ụkpụrụ bụ ihe ga-adịrị onye ọbụla, diala na ndị ọbịa bi nʼetiti unu.’ ”
17Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
18“Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya,
19ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye Onyenwe anyị.