24Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
25Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
26A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.
27“ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie.
28Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.