22“ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
23bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
24Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.
25Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
26A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie.