20Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu Onyenwe anyị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka.
21Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
22“ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis,
23bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
24Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie.