Ọnụọgụgụ 15

Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Numbers 15:36 (UKJV) And all the congregation brought him without the camp, and stoned him with stones, and he died; as the LORD commanded Moses.

34Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.

35Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”

36Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

37Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

38“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.