32Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
33Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
34Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.
35Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.”
36Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.