30“ ‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
31Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
32Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.
33Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel.
34Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya.