28Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ.
29Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu.
30“ ‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu Onyenwe anyị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel.
31Nʼihi na ha eledala okwu Onyenwe anyị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”
32Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike.