5Ọ ga-eweta otu lita mmanya dịka onyinye ihe ọṅụṅụ maka nwa atụrụ ọbụla e ji chụọ aja nsure ọkụ maọbụ aja ụzọ.
6“ ‘Ọ bụrụ nwa ebule ka e ji achụ aja ahụ, weta lita ezi ụtụ ọka anọ na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ jitụ ntakịrị karịa otu lita,
7tinyekwa ya mmanya jitụ ihe nta karịa otu lita ka ọ bụrụ onyinye ihe ọṅụṅụ nye ha, dịka aja nke isisi ya dị ụtọ nye Onyenwe anyị.
8“ ‘Mgbe i ji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, maọbụ aja imezu nkwa, maọbụ aja udo nye Onyenwe anyị,
9tinyere oke ehi ahụ, ị ghaghị iji ezi ụtụ ọka ruru lita isii na ọkara, nke a gwakọtara ya na mmanụ ruru lita abụọ.