17Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
20Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
21“Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”