16Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
17Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
20Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,