21“Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
22Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
23Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
24“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’ ”
25Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.