Ọnụọgụgụ 16

Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.

Numbers 16:29 (UKJV) If these men die the common death of all men, or if they be visited after the visitation of all men; then the LORD has not sent me.

27Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.

28Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.

29Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.

30Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.”

31Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.