Ọnụọgụgụ 16

Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.

Numbers 16:27 (UKJV) So they got up from the tabernacle of Korah, Dathan, and Abiram, on every side: and Dathan and Abiram came out, and stood in the door of their tents, and their wives, and their sons, and their little children.

25Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.

26Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”

27Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.

28Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.

29Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.