32ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
33Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi.
34Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
35Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
36Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,