Ọnụọgụgụ 16

Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

Numbers 16:35 (UKJV) And there came out a fire from the LORD, and consumed the two hundred and fifty men that offered incense.

33Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi.

34Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”

35Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

36Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

37“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.