Ọnụọgụgụ 18

Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”

Numbers 18:19 (UKJV) All the heave offerings of the holy things, which the children of Israel offer unto the LORD, have I given you, and your sons and your daughters with you, by a statute for ever: it is a covenant of salt for ever before the LORD unto you and to your seed with you.

17“Ma a gaghị agbara nwa ehi mbụ, maọbụ nwa atụrụ mbụ maọbụ nwa ewu mbụ. Ha dị nsọ. Fesa ọbara ha nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, ma kpọọ abụba ha ọkụ dịka onyinye e nyere site nʼọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.

18Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị.

19Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”

20Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.

21“Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.