18Ozu anụ ndị a niile e gburu ga-abụ nke gị, dịka obi anụ na apata ụkwụ aka nri anụ nke aja mfufe a na-eche nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja si bụrụ nke gị.
19Ihe ọbụla e dopụrụ iche site nʼonyinye nsọ niile ụmụ Izrel chere nʼihu Onyenwe anyị ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke ruuru unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Ọ bụ ọgbụgba ndụ nnu ebighị ebi nʼihu Onyenwe anyị nye gị na ụmụ ụmụ gị.”
20Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Unu agaghị enwe ihe nketa nke ala, a gaghị ekenyekwa unu ala ọbụla nʼala Izrel niile. Nʼihi na mụ onwe m bụ oke na ihe nketa unu nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
21“Enyela m ndị Livayị, onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri ahụ ụmụ Izrel niile na-akwụbatara m. Nke a bụ ihe nketa ha nʼihi ọrụ ha na-arụ nʼụlọ nzute.
22Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.