Ọnụọgụgụ 18

Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.

Numbers 18:4 (UKJV) And they shall be joined unto you, and keep the charge of the tabernacle of the congregation, for all the service of the tabernacle: and a stranger shall not come nigh unto you.

2Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.

3Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ.

4Ha ka ọ dịrị, isonye gị nʼilekọta ụlọ ikwu ahụ, ya bụ, ihe niile metụtara ụlọ ikwu anya. O nweghị onye ọzọ nke ga-abịa nso ebe ị nọ.

5“Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ.

6Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.