14“Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
15Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
16“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
17“Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute.
18Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.