1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
2“Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ Onyenwe anyị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya.
3Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya.
4Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa.
5Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ.