18Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
19Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
20Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo.
21Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
22Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn.