Ọnụọgụgụ 2

Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

Numbers 2:30 (UKJV) And his host, and those that were numbered of them, were fifty and three thousand and four hundred.

28Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).

29Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan.

30Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).

31Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.

32Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.