Ọnụọgụgụ 20

Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”

Numbers 20:17 (UKJV) Let us pass, I pray you, through your country: we will not pass through the fields, or through the vineyards, neither will we drink of the water of the wells: we will go by the king's high way, we will not turn to the right hand nor to the left, until we have passed your borders.

15Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.

16Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.

17Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”

18Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”

19Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.