Ọnụọgụgụ 20

Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”

Numbers 20:26 (UKJV) And strip Aaron of his garments, and put them upon Eleazar his son: and Aaron shall be gathered unto his people, and shall die there.

24“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.

25Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.

26Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”

27Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.

28Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.