23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
24“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
25Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
26Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
27Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.