21Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
22Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
24“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
25Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.