Ọnụọgụgụ 20

Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.

Numbers 20:21 (UKJV) Thus Edom refused to give Israel passage through his border: wherefore Israel turned away from him.

19Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”

20Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.

21Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.

22Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.

23Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.