2Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
3Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
4Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
5Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
6Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.