Ọnụọgụgụ 21

Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.

Numbers 21:1 (UKJV) And when king Arad the Canaanite, which dwelt in the south, heard tell that Israel came by the way of the spies; then he fought against Israel, and took some of them prisoners.

1Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha.

2Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”

3Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.