14Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
15na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”
16Mgbe ahụ, ụmụ Izrel niile biliri njem bịarute Bịa bụ nʼolulu mmiri ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis iwu sị, “Kpọkọtaa ndị Izrel niile, nʼihi na m na-aga inye ha mmiri.”
17Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bụrụ abụ a. “Sọpụta gị olulu mmiri! Bụọnụ abụ banyere mmiri a!
18Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.