Ọnụọgụgụ 21

“Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”

Numbers 21:22 (UKJV) Let me pass through your land: we will not turn into the fields, or into the vineyards; we will not drink of the waters of the well: but we will go along by the king's high way, until we be past your borders.

20Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.

21Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,

22“Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”

23Ma Saịhọn ekweghị na ụmụ Izrel ga-esi nʼoke ala ya gafee. Ọ chịkọtara ndị agha ya niile, zọpụ ije ibu agha megide ndị Izrel nʼime ọzara ahụ. Mgbe o rutere Jehaz, ọ lụsoro Izrel agha.

24Ma Izrel jiri mma agha gbuo ya. Nwetara onwe ha ala ya, site nʼiyi Anọn ruo nʼiyi Jabọk, gamiekwa rute nʼoke ala ha na ndị Amọn, ha kwụsịrị nʼihi nʼoke ala ndị Amọn siri ike karịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.