Ọnụọgụgụ 21

Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.

Numbers 21:20 (UKJV) And from Bamoth in the valley, that is in the country of Moab, to the top of Pisgah, which looks toward Jeshimon.

18Olulu mmiri ụmụ ndị eze gwuru nke ndị ndu anyị doziri. Mkpara eze ha na mkpara ha, ka ha ji gwuo ya.” Emesịa, ha hapụrụ ọzara ahụ, gaa nʼihu ruo nʼobodo Matana.

19Ha si Matana jeruo Nahaliel, si Nahaliel jeruo Bamot.

20Sitekwa Bamot rute na ndagwurugwu ahụ dị nʼọhịa Moab, ruo nʼugwu Pisga, nke chere ihu nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.

21Ndị Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn, eze ndị Amọrait, sị ya,

22“Biko, kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Anyị agaghị atụgharị banye nʼime ala ubi gị maọbụ nʼubi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmiri site nʼolulu mmiri ọbụla dị nʼala gị. Anyị ga-eje nʼokporoụzọ eze tutu ruo mgbe anyị ga-agabiga oke ala gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.