Ọnụọgụgụ 21

Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.

Numbers 21:6 (UKJV) And the LORD sent fiery serpents among the people, and they bit the people; and much people of Israel died.

4Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.

5Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.”

6Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel.

7Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha.

8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.