8Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya.
9Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?”
10Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m,
11‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ”
12Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”