15Balak nwara ike ya ọzọ. Nʼoge a, o zipụrụ ụmụ eze ndị dị ọtụtụ na ndị a maara aha ha karịa ndị mbụ.
16Ha jiri ozi a bịakwute Belam sị ya, “Ihe a ka Balak nwa Zipoa sị anyị zie gị, Ọ sị gị ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịbịakwute m.
17Nʼihi na aghaghị ịsọpụrụ gị nʼebe ọ dị ukwuu m, mekwaa ihe ọbụla ị sị m mee. Naanị bịa ka ị bụọrọ m ndị a ọnụ.”
18Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.
19Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe Onyenwe anyị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.”