37Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
38Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
39Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot.
40Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ.
41Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.