36Mgbe Balak nụrụ na Belam nọ nʼụzọ na-abịa, ọ pụrụ gaa izute Belam nʼotu obodo Moab nke dị nʼọnụ mmiri Anọn, nke dị na ngwụcha oke ala ya.
37Mgbe ọ bịarutere, Balak jụrụ Belam ajụjụ sị ya, “Eziri m gị ozi ka ị bịa ngwangwa, gịnị mere ị bịaghị? Ọ bụ na m enweghị ike ịsọpụrụ gị?”
38Belam zaghachiri, “Lee, Abịakwutelam gị ugbu a, ma enweghị m ike ikwu ihe ọbụla dị m mma. Ọ bụ naanị ihe Chineke tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu.”
39Belam sooro Balak gaa Kiriat Huzot.
40Balak jiri ehi na atụrụ chụọ aja. O nyere Belam ụfọdụ, nyekwa ma ndị ozi eze ndị ya na ha nọ nʼebe ahụ.