Ọnụọgụgụ 24

Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.

Numbers 24:1 (UKJV) And when Balaam saw that it pleased the LORD to bless Israel, he went not, as at other times, to seek for enchantments, but he set his face toward the wilderness.

1Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.

2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.

3O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.