11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?
14Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.”
15Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: “Amụma Belam nwa Beoa, amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma,