9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”
10Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.
11Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.”
12Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,
13‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?