2Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.
3O buru amụma ndị a sị, “Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe.
4Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe.
5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.