5“Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, ebe obibi gị niile, gị Izrel!
6“Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri.
7Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. “Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, a ga-ebulikwa alaeze ha elu.
8“Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. Ha nwere ike dịka atụ. Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha.
9Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? “Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.”