1Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko.
2Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.
3Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha.