10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
11“Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha.
12Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
13Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.