12Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya.
13Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.”
14Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn.
15Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia.
16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,