16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
17“Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha.
18Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”