39Ikwu Shufam site na Shufam, ikwu Hufam site na Hufam.
40Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ, ikwu Aad site na Aad, ikwu Neeman site na Neeman.
41Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii (45,600).
42Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Shuham, site na Shuham. Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan.
43Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400).