43Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ (64,400).
44Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Imna site na Imna, ikwu Ishvi, site na Ishvi, ikwu Beriya, site na Beriya.
45Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a: ikwu Heba, site na Heba, ikwu Malkiel, site na Malkiel.
46Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.
47Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).